Asusu Igbo amakaa

Asusu Igbo amakaa Contact information, map and directions, contact form, opening hours, services, ratings, photos, videos and announcements from Asusu Igbo amakaa, Enugu state, Trans Ekulu.

ABU { POETRY } - CHINEDU E. OFOMATA              NWA MMEHIELee onwe gị anyaAhụ gị niile unyi unyiUdele ka gị mmaIsi gị k...
20/04/2024

ABU { POETRY } - CHINEDU E. OFOMATA


NWA MMEHIE

Lee onwe gị anya
Ahụ gị niile unyi unyi
Udele ka gị mma
Isi gị ka nke nkapi
I mejuola, tetọọ ma pitọo
Ọ dọrọla

Ịhụ gị bụ ọnwụ ọnwụ
Azụ gị bụ njọ njọ
Akụkụ gị, ilu ilu
Okpuru gị apịtị apịtị
Ije gị bụ nlaghachi azụ gị
Ime Obi gị bụ urukpu urukpu
Echiche gị juputara n'ọchịchịị

Nwa mmehie
Tụgharịa ma lezie anya
Chọba Chukwu kere gị
Ma gbakwuru ya
Gwa onwe gị eziokwu
Ka ụwa kuru gị
Ma nye gị ọnọdụ kwesịrị gị.

22/03/2021

AKUKO IFO
MBE NA CHUKWU { AGBA NK'ABUO}

Chukwu wee si Mbe "o kwa m gwara gi ejila ututu ma obu ehihe ma obu abali bia"? Mbe wee juo wa ma ugbua abu ututu ka obu ehihe ka obu abali? Chukwu we juo ya ozo si ya "o kwa m gwara gi esila ohia ma obu uzo wee bia"? Mbe wee si ya na ya si na mpio owa mmiri ideyi wee bia. Chukwu wee juo ya ozo si "o kwa m gwara gi ka mmanya ahu ghara iju eju, gharakwa idi ugwu"? Mbe wee juo ya si ya "mmanya nkea, o juru eju n,ikwe ka o di n'ugwu?
Chukwu nyere Mbe otu oke na otu nnekwu okuko ka nke ahu gasiri, si ya na nke oke ga-enyi akwa. Ebe nke nnekwu okuko ga akwa akwa. Mbe wee nara okuko abuo ahu laa. Otu ubochi, Mbe wee puo n'etiti ahia were osisi tie onwe ya n'isi bewee akwa; na-asi na mmiri erie ya. Ajuru Mbe ihe na-eme ya, o wee si na nna ya nwuru ka o na-amu nwa, ebe nne ya nwuru ebe o na-alu ogu. Chukwu wee tie mkpu juo Mbe na nwoke a na-atu ime, nwaanyi o na-eje ogu? Mbe wee juo chukwu ma oke okuko o na eyi akwa, nnekwu okuko, o na-akwa akwa?

20/01/2017

ABU ( POETRY )

ISI OKWU = URA { SLEEP }

Ura bu nwanne onwu
Ha abuo achoghi mmeghari ahu
Ha achoghi isape anya
Ha achoghi oke oru
Ha abuo na-anapu uche

Ura na-aghori mmadu
Na-ewepu uche na nsogbu
O na azunye mmadu ugboala
Na-achotara mmadu odi ya n'obi
N'ikpeazu, porokoto aburu ihe efu

Ura tokariri egwu Awilo
Kpururufururushii
Shirikpurufishii
Umunne ana-egere egwu
Agbataobi anoro n'iwe
Mmadu niile anoro na nche

Ura bu ogboogu
Ndi oru ugbo na aghasa ogu na mma
Ndi olu bekee edosa mkpisiodee
Mekaniiki achikoo ngwaoru
Ozuahia akpochie ulo ahia ya

Mmadu abuo meriri ura
Ndi Dinta meriri ura
Oru ha napuru ha ura
Warim, kpatum, o bu anu?

Ekperime meriri ura
Onye ji oku,?
Gbanyuo oku
Mopoo
Kapoo
Tigbuo
Gbaguo
O choghi ura.

13/12/2016

Igbo kwuru si na-atuo ilu nkirika nkata agadi nwaanyi achiri uche n'aka.

Gwa m Gwa m Gwa m ihe wuru ulo n'elu ma biri n'ala?
20/11/2016

Gwa m Gwa m Gwa m ihe wuru ulo n'elu ma biri n'ala?

Address

Enugu State
Trans Ekulu
042

Telephone

08057258809

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when Asusu Igbo amakaa posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Share